Sen Akpabio Enyela Nnukwu Nkwado Maka Ikeputa Anioma State site Na Ndigbo Nona Delta State
Written by admin on March 27, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Onye isi izugbe ulo nzuko ukwu Senate ala anyi na okwa Senate President bu Sen Godswill Akpabio ekwunwuola nkwado ya na ebe ogbara okpurukpu nyere ikeputa Anioma State bukwanu ebe ga emejuputa na ndi Igbo ahu bina Delta State.
Sen Akpabio mere ka nke a puta ihe nwanne unya bu Wednesday na Asaba bu isi obodo Delta State na ogbako ‘congress’ otu ndorondoro All Progressives Congress APC chikobara maka mpaghara South South.
Yabu onye Senate President mere ka amata na onye isi ala anyi bu President Bola Ahmed Tinubu na akwado atumatu eji na aka ikeputa yabu Anioma State.
Okwuputara na obu Asaba bu isi obodo Delta State ka odi ugbu a ga abu isi obodo yabu Anioma State ma ekeputa ya.
Sen Godswill Akpabio kowaziri na isi obodo Delta State nke ga afo-afo ma ekeputa Anioma State ga abuzi Warri.
Iga echetazi na obu Sen Ned Nwoko na anochite ogbonta vote Delta North Senatorial District na ulo nzuko ukwu Senate weputara atumatu iwu maka ikeputa habu ndi Igbo bina Delta State, baa ha aha dika Anioma State ma kebata ha mpaghara South East obodo anyi a bukwanu ebe ndi Igbo umunne ha kachasi biri na Nigeria.
Onye nta akuko anyi wetara ozi na obu okpuru ochichi iteolu ahu mejuputara ndi Igbo na Delta State ga aghoro yabu Anioma State ma emecha keputa ya dika Asaba dina Oshimili South LGA ga aga na iru ibu isi obodo State ohuru ahu ma ekeputa ya.
Habu okpuru ochichi iteolu ndi Igbo na Delta State ga aghoro Anioma State gunyere: Aniocha North LGA, Aniocha South, Oshimili North, Ukwuani, Oshimili South, Ndokwa West, Ndokwa East, Ika South nakwa Ika North East LGAs.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.