Ụlọ ikpe dị na Ikorodu, Lagos State ezigala otu nwoke n’ụlọ ọrụ mgbazi kwere maka na ozuru ori.
Written by Onyinye on June 23, 2025
Ụlọ ikpe dị na Ikorodu, Lagos State anọrọla taata bu Monday ziga otu nwoke dị afọ iri anọ bụ Seun Olakunle n’ụlọ ọrụ mgbazi maka ịwaba n’ụlọ wee zuo eriri eletrịkị yabu electrical cable dị nde naira atọ.
Onye Chief Magistrate bu Mazi B. A. Sonuga nyere iwu ka nwa amadi ahụ nọrọ n’ụlọ ọrụ mgbazi ahụ dika o mere nkwuputa na ya zuru eriri eletriki ahụ
Sonuga yinyeziri ụbọchi ikpe ahụ na abalị iri na asaa n’ọnwa July maka inyocha eziokwu n’ikpe ahụ.
Na mbụ ka onye uweojii kpụpụtara ya n’ụlọ ikpe bu ASP Aminu Isaac, gwara ụlọ ikpe ahu na nwa amadi ahụ zuru ori eriri eletriki ahụ na abalị iri na itolu n’ọnwa June na No. 5 Aliqoda Street na mpaghara Oreyo dị na Ikorodu.
Isaac kwuru na o zuru eriri eletriki ahụ site n’aka onye nwe ya bu Mazi Olawale Abimbola, n’okwu ya, ọ mere ka amata na nke ahu megidere alaka 307(2), 339 nakwa 287 nke iwu mpụ nke Lagos State, 2015, dika ozi kọwara na alaka 287 kwuru mkpọrọ afọ atọ maka izu ohi.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.