Ulo Nzuko Nnochite Anya Ogogo Etiti Ala Anyi Ekwuputala Nkwado Ikeputara Ndi Mpaghara South East Otu State

Written by on April 2, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Ulo nzuko nnochite anya ogogo etiti House of Representatives ala anyi ekwuputala nkwado ya ka ekeputakwuoro ndi mpaghara South East otu State iji mezuoro ha State isii mpaghara ndi ozo nwegasiri na ala anyi a.

Yabu ulo nzuko omebe iwu ogogo etiti ala anyi meziri ka amata na obu ikeputa ebe aga akpo Animoma State na mpaghara South East obodo anyi a ka ona akwado.

Ihe ndi a putara ihe na ubochi Wednesday site na onu osote onu na ekwuru ulo nzuko ahu na okwa Deputy Speaker bu Rt Hon Benjamin Kalu oge onabatara ndi otu Anioma State Movement nke obu Sen Ned Nwoko nona isi ha bukwanu ndi megara ya njem mkpoturu na ulo olu ya dina Abuja.

Rt Hon Kalu yoro ndi onu na eru na okwu na ala Igbo ka ha jiko aka onu ma kwado ikeputa yabu Animoma State.

Okowaziri na yabu Animoma State ka aga enweta site na ikeputa ufodu mpaghara Anambra nakwa Imo State chiko ha onu nyere ndi Igbo Delta ana aturu atumatu Anioma State ma kpozia ha Animoma State.

Na ihe banyere ebe ga abu isi obodo yabu Animoma State ma ekeputa ya ka Rt Hon Benjamin Kalu mere ka amata na aga enwe mkpebi banyere ya site na ezi ububo nakwa nkwekorita na udi ochichi onye kwuo uche ya.

Na mbu na okwu ya ka Sen Ned Nwoko kowara na njem mkpoturu ha bu ikene Rt Hon Kalu maka mbo ya ikwalite ezi onodu ndorondoro na mpaghara South East.

Na otu aka ahu ka onye eze odinala na elekota Ubulu-Uno Kingdom nke ndi Igbo Delta bu HRH Eze Henry Kikachukwu kowara izo maka nkeputa Anioma State dika ihe kwesiri ekwesi ma elegara anya na otu agburu jikoro Igbo niile onu.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited