Ulo Olu INEC Agbanwela Na Ozuzu Oke Ya Ubochi Ntule Aka Ochichi Afo 2027

Written by on February 27, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Ulo olu Independent National Electoral Commission INEC eweputala na ozuzu oke ya mkpatughari aka na usoro ka ihe ga esi gagasia na ntule aka ochichi izugbe afo ozo akporo 2027 General Elections’ Timetable ma gbanwe ubochi aga achikoba ntule aka ochichi okwa onye isi ala na nke ndi omebe iwu ogogo etiti nakwa nke ndi aka na achi State gunyere ndi omebe iwu ogogo State.

Nke a putara ihe na ozuzu oke na abali unya bu Thursday site na ozi onye National Commissioner ma burukwa onye isi oche ngalaba mgbasa ozi nakwa nkuzi akporo INEC Information and Voter Education Committee bu Malam Mohammed Kudu Haruna nyefere ndi nta akuko.

Iga echeta na ulo olu INEC noro na mbu weputa abali iri abuo nke onwa February afo 2027 dika ubochi ntule aka ochichi maka okwa onye isi ala na nke ndi omebe iwu ogogo etiti akporo Presidential and National Assembly Elections ma weputa abali isii nke onwa March yabu afo ozo maka nke okwa ndi aka na achi State nakwa ndi omebe iwu ogogo State na udi Governorship and State Assembly Elections.

Ka osiladi, Malam Kudu Haruna noro na ozi a oweputara ndi nta akuko na abali putara taata kowa na enwere mgbanwe ohuru na ubochi habu ntule aka ochichi kwere maka mkpagharita aka na iwu ntule aka ochichi ala anyi nke afo 2022 anoro na odi nso a mee ma buru nke onye isi ala binyegoro aka oghoro iwu 2026 Electoral Amendment Act.

Yabu onye National Commissioner ulo olu INEC kowaziri na ntule aka ochichi nke okwa onye isi ala na ndi omebe iwu ogogo etiti buzi na abali iri na isii nke onwa January afo ozo ka oga ewere onodu, ebe nke okwa ndi aka na achi State nakwa ndi omebe iwu ogogo State ga abu na abali isii nke onwa February afo ozo.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited