Ulo olu INEC agbatikwuola oge nyere ndebanye aha maka ndi ga atu akwukwo vote na Anambra state

Written by on July 18, 2025

Ulo olu Independent National Electoral Commission INEC agbatikwuola oge nyere ndebanye aha ndi ga atu akwukwo vote bu nke n’ aga n’ iru ugbua.

Nkpebi a putara ihe n’ oge ha nwechara nzuko izu uka ha tata bu Thursday.

Na yabu nzuko ka ha noro lebara anya na nkwadobe n’ aga n’ iru maka ntuliaka ndi Governor na Anambra state nakwa akwukwo ndebanye aha otutu otu ndorondoro detara ha .

Ulo olu INEC meziri ka amata na afo juru ha etu ndi mmadu Siri nuputa n’ igwe n’ uzo udo maka ndebanye aha ndi ga atu vote bu nke n’ aga n’ iru na ogige ndebanye aha di nari ato na iri abuo na isii enwere na Anambra State.

Okowara na k’ odi unya bu Wednesday abali iri na isii nke onwa July afo a,na mmadu di puku iri itolu na isii na iri asato na ise bu ndi edebanyegoro afa nani na mkpuru ubochi itolu dika aka nwekwara otutu ndi nke ka chokwara idebanye aha nke ha.

N’ ihi nkea,ka ulo olu INEC jiri nwe nkpebi site n’ aririo umu afo Anambra State gbatikwuo oge nyere yabu usoro ndebanye aha bu nke kwesiri ikwusi tata bu Thursday,ka oruzie ubochi uka ga abu abali iri abuo nke onwa July afo a anyi no n’ ime ya.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited