OYA MPOX EBURULA AGHA OHURU OZO BANYE N’ OTUTU STATE DINA NIGERIA

Written by on September 11, 2024

Oya Mpox nke amara na mbu dika Monkey Pox agala n’ iru n’ amubanye n’ obodo anyi a bu Nigeria dika ulo olu Nigeria Centre for Disease Control and Prevention NCDC noro taata bu Wednesday kwuputa mmadu iri isii na asaa oya ojo a kpatara aka ohuru n’ ala anyi.

NCDC mere ka nke a puta ihe n’ ogbako ochikobara ndi nta akuko taata na Abuja igwa ohaneze ndi Nigeria ka eke siri anya anwu banyere yabu oya Mpox buzi oya ulo olu aruike mba uwa akporo World Health Organization WHO kwuputagoro dika odachi ozuru uwa onu.

NCDC kowara n’ obu States iri abuo na ato n’ ime States iri ato na isii enwere n’ ala anyi gunyekwuoro Abuja ka esiri nweta ndi a butere yabu oya ohuru.

N’ okwu ya ka Director General yabu ulo olu n’ ebu agha mgbochi nakwa nchikwanata oya n’ ala anyi bu Dr Jide Idris gwara ndi nta akuko n’ obu mmadu di otu puku, iri ato na otu k’ emere nnyocha ma nyochaputa ndi a di iri isii na asaa butere yabu Mpox ohuru.

Onyeziri nkowa States ndi ahu esitere bute oya a nakwa mmadu one butere ya kwa States dika: Akwa Ibom – mmadu asato, Enugu – mmadu asato, Bayelsa – mmadu isii, Cross River – mmadu ise, Benue – mmadu ano, Plateau – mmadu ano, Delta – mmadu ano, FCT Abuja – mmadu ato, Imo – mmadu ato, nakwa Lagos – mmadu ato, Rivers – mmadu abuo, Abia – mmadu abuo, Osun – mmadu abuo gunyere Anambra nwetakwuru mmadu abuo nakwazi Ogun State enwetara mmadu abuo ozo butere oya a.

States ndi ozo bukwanu States obu naani otu onye butere oya a n’ otu na’ otu gunyere: Kaduna, Gombe, Edo, Niger, Ebonyi, Nasarawa, Kebbi nakwa Oyo State.

Tagged as

Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies