UFODU OTU EGWUREGWU BALL ASUOLA IBE HA AKWU NA EPL

Written by on September 15, 2024

Anorola n’ agbata ngwucha izu uka anyi puru n’ ime ya unya bu Saturday nakwa mbido izu uka anyi banyere na ya taata bu uka mata mbe n’ abuo nke bu oke n’ ogogo asompi English Premier League EPL nke obodo England dina mba United Kingdom amakwuru dika mba Britain.

Nke a bu dika otu egwu ball Manchester United noro unya bu Saturday jide otu egwu ball Southampton na bee ha jiri okpu goal ato ana enweghi nke asatara bie ha aka ojo n’ aru.

Otu egwu ball Nottingham Forest nokwara unya bu Saturday gaa bee ndi Liverpool ma jiri otu okpu goal ana enweghi nke asatara gosi Liverpool ihe oku ji nti oke eme.

Manchester City noziri na bee ya nabata Brentford ma gba ha okpu abuo asatara otu, ebe Fulham nakwa West Ham ji otu okpu otu okpu gba onwe ha onye naba onye naba.

Otu egwu ball Crystal Palace nakwa Leicester City zutere onwe ha ma jiri okpu abuo abuo gba onwe ha onye naba onye naba, ebe Brighton nakwa Ipswich Town gbara onwe ha onye naba onye naba na enweghi onye satara okpu goal n’ ime ha.

Aston Villa noro na bee ya nabata otu egwu ball Everton ma jiri okpu goal ato asatara abuo gosi Everton na nwoke na ibe ya raa buna onu.

N’ ikpeazu yabu unya, ka Chelsea gara na bee otu egwu ball Bournemouth ma jiri otu okpu goal ana enweghi nke asatara gosi yabu Bournemouth n’ onwere ike ka ike.

K’ oruziri taata bu uka ka otu egwu ball Arsenal gara na bee Tottenham ma jiri otu okpu ana enweghi nke asatara pia Tottenham utali mmuo n, aru.

Asompi ikpeazu were onodu taata bu nke dajuru n’ etiti otu egwu ball Wolves nakwa Newcastle United, ebe Newcastle ji okpu abuo asatara otu kwaara Wolves nkwa onwu.

Tagged as

Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies