Gov Soludo Agbalara Commissioner Mgbasa Ozi Anambra State Ugbonwamkpi

Written by on September 17, 2024

Aka n’ achi Anambra State bu Gov Charles Chukwuma Soludo anorola taata bu Tuesday gbara Commissioner State ahu n’ ahu maka mgbasa ozi bu Hon Paul Nwosu ugbonwamkpi n’ okwa olu ya.

Ozi sitere n’ obi ochichi State ahu dina Awka n’ akowa na Gov Charles Soludo napuru nwa amadi a okwa olu ya kwere maka ebubo amaghi aru nke oma dika osiri di n’ adighi ike egosiputara uwa niile olu ochichi State ahu n’ aru ma elegara anya n’ obu ya bu onye isi mgbasa ozi nakwa nzikorita ozi dika Commissioner mgbasa ozi.

Onye gwara ndi nta akuko okwu site na yabu obi ochichi Anambra State ma buru onye yoro ka aghara ikpo aha ya n’ ikuku mere ka amata na Hon Paul Nwosu akwakorogo ngwongwo ya n’ ulo olu Anambra State Ministry of Information mana eche ka ekwuputa ochuchu ahu achuru ya n’ okwa n’ ozuzu oke ya.

Otutu ndi ozo na Anambra State nke gunyekwara ndi isi ochichi State ahu kowara n’ ugbonwamkpi a agbara yabu Commissioner abughi ihe itunanya diara ha kwere maka n’ otego ha chere na Gov Soludo kara ichu ya n’ okwa.

Ndi nta akuko na Anambra State kowaziri yabu Commissioner anapuru okwa dika Commissioner mgbasa ozi kachago njo ahutara na State ahu kemgbe ekeputara ya.

Ndi nta akuko a mere ka amata na Hon Paul Nwosu enwenubeghi ka osiri di ike chikoba ogbako ndi nta akuko yaburugodu otu ugboro iji kowara umu afo State ahu ka ochichi Gov Charles Chukwuma Soludo siri aga kemgbe ihe n’ acho iru afo ato ochichi di ugbu a na yabu State nogoro.

Ka osiladi, ozi n’ akowa na Gov Soludo aroputagori ma zigara ulo nzuko omebe iwu Anambra State House of Assembly maka nnyocha nakwa nkwado aha onye ga anochite yabu nwa amadi ogbara ugbonwamkpi.

Tagged as

Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies