Eweputala Ubochi Ozo Maka Nkabi Ikpe Nchitu Na Okwa Onye Isi Oche APC Megide Ganduje

Written by on September 18, 2024

Ulo ikpe Federal High Court ji Abuja mere isi onodu anorola taata bu Wednesday yigharie nkabi ikpe ya nyere akwukwo ikpe ejiri ayo ka achituo Dr Abdullahi Umaru Ganduje na okwa onye isi oche otu ndorondoro All Progressives Congress APC na ala anyi a.

Yabu ikpe ka anoro na mbu tinye na obu taata bu Wednesday, abali iri na asato nke onwa September, afo 2024 ka akara ikabi ya, mana anoziri taata huta na osoghi na akwukwo ikpe edeputara maka nlebara anya.

Yabu ulo ikpe noziri taata yigharie nkabi ikpe a ka oburu na ubochi Monday nke izu uka ozo bu abali iri abuo na ato nke onwa September anyi nona ime ya.

Anyi nwetara ozi na obu ndi otu ndorondoro APC nke mpaghara mgbago ugwu North Central ala anyi kpugara Abdullahi Umaru Ganduje ulo ikpe mana ayo ka ulo ikpe ahu chituo ya na okwa kwere maka ebubo na obughi mpaghara mgbago ugwu North West yabu Ganduje sitere ka okwa APC National Chairman rubere.

Otu ndorondoro APC nke mpaghara North Central sitere na aka onye ndu ha bu Chief Saleh Zazzaga kowa na obu mpaghara ahu bu North Central ka iwu nyere ikikere iweputa onye APC National Chairman mana agahere uzo site na iga kpolite Abdullahi Umaru Ganduje sitere Kano State bu ebe dina mpaghara North West na yabu okwa.

Na akwukwo ikpe a ka otu APC North Central Forum denyere aha Abdullahi Umaru Ganduje, otu ndorondoro APC nakwa ulo olu Independent National Electoral Commission INEC dika ndi nzara onu ha, ebe hana ayo ka ulo ikpe machie Ganduje idizi na ebughari onwe ya dika onye APC National Chairman na udi obuna.

Yabu ikpe ka anoro na mbu tinye n’ obu taata bu Wednesday, abali iri na asato nke onwa September, afo 2024 ka akara ikabi ya, mana anoziri taata huta n’ osoghi n’ akwukwo ikpe edeputara maka nlebara anya.

Yabu ulo ikpe noziri taata yigharie nkabi ikpe a ka oburu n’ ubochi Monday nke izu uka ozo bu abali iri abuo na ato nke onwa September anyi nona ime ya.

Anyi nwetara ozi n’ obu ndi otu ndorondoro APC nke mpaghara mgbago ugwu North Central ala anyi kpugara Abdullahi Umaru Ganduje ulo ikpe mana ayo ka ulo ikpe ahu chituo ya n’ okwa kwere maka ebubo n’ obughi mpaghara mgbago ugwu North West yabu Ganduje sitere ka okwa APC National Chairman rubere.

Otu ndorondoro APC nke mpaghara North Central sitere n’ aka onye ndu ha bu Chief Saleh Zazzaga kowa n’ obu mpaghara ahu bu North Central ka iwu nyere ikikere iweputa onye APC National Chairman mana agahere uzo site n’ iga kpolite Abdullahi Umaru Ganduje sitere Kano State bu ebe dina mpaghara North West na yabu okwa.

N’ akwukwo ikpe a ka otu APC North Central Forum denyere aha Abdullahi Umaru Ganduje, otu ndorondoro APC nakwa ulo olu Independent National Electoral Commission INEC dika ndi nzara onu ha, ebe hana ayo ka ulo ikpe machie Ganduje idizi n’ ebughari onwe ya dika onye APC National Chairman n’ udi obuna.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies