Ntule Aka Okpuruochichi Ime Obodo: Ndi Uwe Oji Amachigo Ngaghari Na Enugu State

Written by on September 20, 2024

by Moses Nnabuife Nwekwu

Ndi uwe oji ala anyi na Enugu State amachiela ngaghari ndi mmadu nakwa ugboala na mpaghara nile nke State a malite n’ elekere iri na abuo nke ime abali taata bu Friday ma burukwa uzu ututu echi bu Saturday ruo n’ elekere isii nke uhuruchi yabu echi.

Nke a bu kwere maka ntule aka ochichi Local Govt Elections ga asara oku echi n’ okpuruochichi ime obodo iri na asaa ahu enwere na State a.

N’ ozi onyefere ngalaba akuko uwa anyi taata bu Friday ka onye mmekorita ohaneze nyere ndi uwe oji ala anyi na State a bu DSP Daniel Ndukwe mere ka amata na Commissioner habu ndi uwe oji na Enugu State bu CP Kanayo Uzuegbu ezipula puku kwuru puku ndi uwe oji nakwa akuru ngwa olu ha ga enyere ulo olu Enugu State Independent Electoral Commission ENSIEC aka na ntule aka ochichi a.

CP Uzuegbu sitere n’ ozi a DSP Ndukwe nyefere ngalaba akuko uwa anyi kwe nkwa ezi nchekwa ndu na akuluba ohaneze ndi State a nakwa nke ndi olu gunyere akuru ngwa olu habu ulo olu ENSIEC.

N’ ozi a ka yabu onye Police Public Relations Officer PPRO na Enugu State kowara n’ obu naani ndi ahu no olu puru iche dika; ndi olu aruike, ndi mgbanyu oku, ndi nta akuko, ndi olu ntule aka ochichi a nakwa ndi nleta yabu ntule aka ochichi natara nkwado n’ udi accredited observers ga aputanwu ngaghari n’ oge ntule aka ochichi a.

Okowara na naani ngaghari aga enwe bu mmadu isite na bee ya gaa tuo akwukwo vote ma naghachikwa azu.

Yabu onu n’ ekwuru ndi uwe oji ala anyi na Enugu State gwara ndi nchekwa bu egbe eso ndi gbagotere na obodo ka ha gharakwa igarute nso n’ ogige Polling Boots ntule aka ochichi a.

N’ oge ona akowa na ndi uwe oji ga ejiko aka na olu nyere ndi nchekwa ozo maka ntule aka ochichi a ka DSP Daniel Ndukwe doro aka na nti dogara ndi ji atumatu ogbaghara abia na ntule aka ochichi a ka ha chefuo nke a ma obu ha eche aka ghoro mmanwu ndi nchekwa ga etiri ha.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies