Ebugola Ufodu Ndi Olu Oyibo Ebonyi State Na Ogogo Permanent Secretary

Written by on September 25, 2024

by Moses Nnabuife Nwekwu

Aka n’ achi Ebonyi State bu Gov Francis Ogbonna Nwifuru enyela nkwado mbugo n’ ogogo ahu kachasi elu n’ olu oyibo akporo Permanent Secretary gaara ndi olu oyibo di iri abuo na ato na State ahu.

Nke a putara ihe unya bu Tuesday na Abakaliki site n’ ozi ode akwukwo mgbasa ozi n’ okwa Chief Press Secretary nyere yabu aka n’ achi State bu Dr Monday Uzor nyefere ndi nta akuko.

Habu ndi Permanent Secretaries ohuru Gov Francis Nwifuru nyere nkwado mbugo n’ ogogo olu nakwa okpuru ochichi ime obodo ha sitere gunyere: Dr Lawrence Ezeogo, Barr Samuel Nwede nakwa Dr Simon Idenyi sitechara Abakaliki LGA.

Na Afikpo LGA ka okpolitere Dr Arunne Isioma nakwa Rose Ibe Ugwuoma; ebe ositere na Ebonyi LGA kpolite Dr Linda Aloh, Theresa Anwu nakwa Ogechi Nwobashi; dika obanyere na Ezza North LGA kpolite Cajetan Uhuo nakwa Anthonia Ogechi Igwe.

Na Ezza South LGA ka Gov Nwifuru kpolitere Henry Onyebuchi nakwa Peter Afoke Edeh; ebe obanyere na Ikwo LGA kpolite Dr Ngozi Nwode nakwa Barr Israel Ikechukwu Alobu; dika okpolitere Bridget Nnenna Obasi nakwa Shulamite Mbazu sitere Ivo LGA; Hillary Ogbonna, Matilda Njoku nakwa Mazi Onu Nweze aburu ndi sitere Ohaozara LGA nwetara yabu okwa Permanent Secretary.

Ndi ozo eweburu; Gabriel Odoh nakwa Emmanuel Onwe sitere Ohaukwu LGA; ebe Onicha LGA ka okpolitere Ogbonnaya Okpara nakwa Dr Joy Umoke.

N’ ozi a Dr Monday Uzor nyefere ndi nta akuko ka omere ka amata n’ obu n’ elekere iri nke ututu ubochi Tuesday izu uka ozo bu abali mbu nke onwa October ka Gov Francis Ogbonna Nwifuru ga anoro n’ ulo olu ya dina obi govt ohuru State ahu nke Ochudo Centenary City, Abakaliki duo ndi Permanent Secretaries ohuru a n’ iyi olu.

Tagged as

Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies