Oya Cholera Akwafuola Obara Otutu Ndi Mmadu Ohuru Na Ebonyi State

Written by on September 26, 2024

by Moses Nnabuife Nwekwu

Opekata mpe mmadu iri anwuola dika ndi ozo kariri mmadu iri abuo ka nona ulo ogwu azo ndu ha azo site n’ odachi oya onyunyu na ogbugbo Cholera wakporo Ebonyi State ohuru.

Nke a putara ihe taata bu Thursday site n’ okwu Commissioner State ahu n’ ahu maka aruike bu Dr Moses Ekuma gwara ndi nta akuko na Abakaliki.

Dr Ekuma kowara n’ obu n’ imime obodo Ndiboko nke Ezza-Inyimagu dina Izzi LGA ka habu ihe kariri mmadu iri zutere onwu ike ha site na yabu oya Cholera.

Okowara n’ ebugago ndi nke ahu kariri mmadu iri abuo n’ ulo ogwu ato ndi gunyere: Sudan United Mission Hospital dina Onuenyim Agbaja; nke Sudan United Mission Hospital dina Izziogo nakwa ogige aruike Izziogo Primary Healthcare Centre maka ogwugwo.

Yabu Commissioner aruike na Ebonyi State tara uta si n’ obu enweghi ezi onodu adim ocha nyere ndi obodo ahu butere nfesasi ajo oya a.

Dr Moses Ekuma yoziri ha ka ha bagide adim ocha ndi gunyere: ikwusi iga mposi n’ ohia, idi na akwo aka oge niile, idi na ekpuchi nri oriri ha nke oma nakwa idi n’ anu naani mmiri ndi ahu di ocha.

N’ aka nke ya ka onye isi oche Izzi LGA bu Barr Stephen Emenike Nwankpa kenere govt Ebonyi State maka ime ngwangwa gbata oso enyemaka nke nnaputa otutu na ime ndi ahu oya a kpatara aka ojo.

Tagged as

Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies