Otu Nwoke Efuola Na Ike Na Enugu State

Written by on September 26, 2024

by Moses Nnabuife Nwekwu 

Otu nwoke gbara afo iri ato enyere aha ya dika mazi Emmanuel Okpara efuola na ike n’ ebe obibi ha dina mpaghara Iva Valley nke isi obodo Enugu.

Nke a putara ihe n’ ozi onye mmekorita ohaneze nyere ndi uwe oji ala anyi na Enugu State bu DSP Daniel Ndukwe nyefere ngalaba akuko anyi bukwanu ebe onoro kowa n’ obu nwa nwanne nna nwoke a bu Odoziaku Grace Okpara wetara habu ndi uwe oji ozi maka ofufu nakwa ochicho ana acho yabu nwa amadi.

DSP Ndukwe kowara n’ obu kemgbe abali iri nke onwa September anyi nona ime ya ka afudebere yabu mazi Emmanuel Okpara dika orapuru ebe obibi ha ahu dina Iva Valley gawa ebe ana amaghi, ebe mbo niile agbagoro ichoputa ebe ono enweghi nke mitara mkpuru.

Yabu onye Police Public Relations Officer PPRO na Enugu State mere ka amata na nwoke a n’ efu efu bu nwa afo obodo Uburu nke Ohaozara LGA dina Ebonyi State, ebe odibere ogologo na ntu feet ise n’ uma ato, ma nwe akpukpo aru di ocha, dika onwekwara akara agburu bu tribal mark n’ iru ya.

Yabu onu n’ ekwuru ndi uwe oji ala anyi na State a kowara na nwoke a n’ efu efu nwere nsogbu nke ikwu okwu ebe onwekwuru nsogbu inu ihe na nti.

DSP Daniel Ndukwe mechara yoo ohaneze onye nwere ozi ga enye aka ichoputa ebe nwoke a no ka okpoturu isi ulo olu ndi uwe oji didebere ya nso.

Tagged as

Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies