Otu Obere Nwa Sitere Ebonyi State Efuola Na Enugu State

Written by on September 26, 2024

by Moses Nnabuife Nwekwu

Ndi uwe oji ala anyi na Enugu State ekwuputala maka ofufu nakwa ochicho ana acho otu obere nwata nwaanyi gbara afo ise enyere aha ya dika nwada Onyedika Ogbodo n’ isi obodo Enugu.

N’ ozi onyefere ngalaba akuko uwa anyi ka onye mmekorita ohaneze nyere ndi uwe oji ala anyi na State a bu DSP Daniel Ndukwe mere ka amata n’ obu nwanne nne
obere nwa a bu mazi Solomon Nweze wetara habu ndi uwe oji ozi maka ofufu yabu obere nwata nwaanyi bukwanu nke okowara na amalitere icho ya acho kemgbe abali iteolu nke onwa September anyi nona ime ya orapuru ebe obibi ha dina mpaghara Iva Valley nke isi obodo Enugu.

DSP Ndukwe gwara ngalaba akuko uwa anyi na yabu nwada Onyedika Ogbodo bu nwa afo obodo Ezza-Ohaukwu nke Ohaukwu LGA dina Ebonyi State, ebe asusu Igbo nakwa nke bekee na aga ya werewere na onu, dika akpukpo aru ya di ocha ma didebe ogologo na ntu feet ato, ebe ona enweghi akara agburu akporo tribal mark na aru.

Yabu onye Police Public Relations Officer PPRO na Enugu State gwaziri ohaneze onye nwere ozi ga enye aka ichota obere nwa a ka okpoturu isi ulo olu ndi uwe oji di ya nso.

Tagged as

Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies