Govt Enugu State Akatola Agwa Ekperima Sitere Na Aka Mmanwu Oriokpa Nsukka

Written by on September 26, 2024

by Moses Nnabuife Nwekwu

Govt Enugu State ekwuputala mgbaru iru ya megide ajo onodu chiboo anuta ma hutakwa ozo ka njo n’ ihe banyere ike ojo mmanwu Oriokpa n’ akpa n’ ufodu obodo enwere na Nsukka LGA nke State a.

N’ ozi onyefere ndi nta akuko taata bu Thursday n’ isi obodo Enugu ka Commissioner State a n’ ahu maka okpuru ochichi ime obodo, echimechi nakwa mmepe imime obodo bu Deacon Okey Ogbodo jiri aha govt State a nye ntuzi aka imalite nnyocha miri emi megide agwa ojo habu mmanwu Oriokpa nakwa ndi otu ha.

Deacon Ogbodo sitere na ozi a kwuputa na aka na achi Enugu State bu Gov Peter Ndubuisi Mbah enyela ntuzi aka ojiri kpo oku nzuko ga ewere onodu echi bu Friday nyere ndi eze odinala nakwa Presidents General sitere obodo ndi ahu ike ojo mmanwu Oriokpa metutara na Nsukka LGA nke State a.

Yabu Commissioner gwara ndi nta akuko na obu na elekere mbu nke ehihe echi bu abali iri abuo na asaa na onwa September anyi nona ime ya ka nzuko a ga ewere onodu na isi ulo olu ya dina ogige State Secretariat nke isi obodo Enugu.

Oguputara obodo ndi ahu nke a metutara na Nsukka nke ndi eze odinala nakwa ndi Presidents General ha ga esonyere na nzuko a dika obodo; Nguru, Isiakpu, Echara, Nru, Edem-Ezema, Iheagu, Ihe, nakwa Owere gunyere obodo Umuoyo.

Na oge ona ekwuputa nkasi obi govt State a gaara ezinulo ndi akowara na ha tufuru ndu ha na ike ojo habu mmanwu Oriokpa ka Deacon Okey Ogbodo mere ka amata na Gov Peter Mbah enyego Commissioner ndi uwe oji ala anyi na State a ntuzi aka ka omalite nnyocha miri emi nyere nke a.

Onye nta akuko anyi nwetara ozi na mmanwu Oriokpa nakwa ndi otu ha noro na odi nso a kpa ike ojo ozo na Nsukka LGA, ebe ha napuru ufodu ndi mmadu ndu ha na ike ma merukwa ndi ozo aru.

Tagged as

Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies