AKAGHIM IRUNYE OKPORO UZO NA OBODO GI MA ASI NAM BU AJO MMADU KA GOV FUBARA NA AGWA WIKE
Written by admin on December 11, 2024
Aka na achi Rivers State bu Gov Siminalayi Fubara enyela ndumodu gaara ndi okwe ndorondoro ka ha kwusi oke ochicho nke onwe ma bagidezie na ihe ndi ahu ga akwalite mmepe nakwa odimma ohaneze.
Aka na achi Rivers State nyere ndumodu a unya bu Tuesday na mmeme mgbape okporo uzo Okocha road dina mpaghara Rumu Olumeni nke Obio Akpor LGA na State ahu.
Yabu olu ngo okporo uzo ka ozi kowara na obuna okpuru ochichi ime obodo nwa amadi ahu jitopuru okwa Governor State ahu ma noro ugbu a na okwa FCT minister ma burukwa onye na agbaso ya mgba okpuru na ochichi bu Ezenwo Nyesom Wike ka orunyere ya.
Gov Fubara mere ka amata na ochichi abughi naani maka odimma ndi na akwado onye nona isi ugbo kama maka odimma ohaneze ndi onodo ana achi.
Ogara na iru kwuputa na ya akaghi iga olu ngo okporo uzo na okpuru ochichi ahu Nyesom Wike sitere ma asi na ya bu ajo mmadu.
Iga echetazi na Gov Siminalayi Fubara nakwa Ezenwo Nyesom Wike anola kemgbe na enwe nghotahe nke ogbaghara ndorondoro isi ka isi na Rivers State ma burukwa nke mbo ogbugbo niile
agbagoro megide ya kuchara afo na ala.