Ulọ ikpe ụkwụ nke Rivers State High Court dị na Portharcourt amala otu nwoke bụ Eze Kingsley ikpe ọnwụ na aga eji udo dogbue maka ogbugbu nke o gburu Wagbara David lagoro mmụọ.

Written by on February 13, 2025

Ulọ ikpe ụkwụ nke Rivers State High Court dị na Portharcourt amala otu nwoke bụ Eze Kingsley ikpe ọnwụ na aga eji udo dogbue maka ogbugbu nke o gburu Wagbara David lagoro mmụọ.

Eze Kingsley ka e kwuru na ọ kpara ya bụ n’abalị asaa nke ọnwa December n’afọ 2018 Nọ 4 Rumumasi Community nke dị na okporo ụzọ East West road Portharcourt.

Esemokwu nke butere ọnwụ nwoke ahụ ka e kwuru na ọ malitere mgbe Kingsley yana onye conductor nke ụgbọala tanker yana David Wagbara bụ onye ọrụ nke ọba nchekwa ozu nwere nghọtahe. Ozi kwuru na David gwara onye conductor ahụ ka o bupu ụgbọala ahụ n’ogige ebe nchekwa ozu na ọ nọchiri ya ụzọ.

Na nkabi ikpe ya ka Justice Boma Diepiri kwuru na ndị kpụpụrụ Kingsley n’ụlọ ikpe akọwala onwe ha nke ọma nke gosiri na Kingsley kpara ya bụ na eziokwu.

O wee kwuo na aga etinye nwoke ahụ eriri n’olu ma dolie ya elu ruo mgbe ọ ga ekubi ume. Ọ rịọrọ Chineke ka ọ nabata mkpụrụ obi Kingsley Eze n’alaeze eluigwe.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Designed By Getmorc Technologies