Aka na-achị Rivers State bụ Gov Siminalayi Fubara emela ka amata banyere amụma state ahụ ji n’aka ikpokọnata ngalaba ihe ọmụmụ niile nke mahadum Rivers State University
Written by admin on February 13, 2025
Aka na-achị Rivers State bụ Gov Siminalayi Fubara emela ka amata banyere amụma state ahụ ji n’aka ikpokọnata ngalaba ihe ọmụmụ niile nke mahadum Rivers State University ka ọ nọrọ n’otu ebe akpọrọ main campus dina Portharcourt bụ isi obodo state ahụ.
Gov Fubara kwupụtara nkea n’oge ọ nabatara ndị eze ọdịnala sitere n’obodo Kalabari n’obi gọọmenti state ahụ ụnyaahụ bụ Tuesday. N’oge ahụ ka ọ nọrọ katọọ ogbo ya nyefere ya ọkwa ọchịchị bụ Nyesom Wike maka ikewasị ogige campus ahụ ka ọ nọrọ iche iche.
Wike bụ ya mere ka ngalaba ihe ọmụmụ mahadum ahụ nọrọ iche iche bụ nke o kwuru na ya chọrọ iweta mmepe n’ime ime obodo n’oge ahụ.
Mana o nweghịzi ihe a nụrụ ọzọ banyere ngalaba Emohua campus, Ahoada campus yana Etche campus.
N’okwu ọ gwara ndị eze ọdịnala ahụ Gov Siminalayi Fubara kwuru na gọọmenti gara aga mere nke ahụ n’enweghị ezi ụkpụrụ ọrụ ọbụla ha ji n’aka mee nke ahụ.
O kwere ndị eze ọdịnala sitere obodo Kalabari ahụ nkwa ịmere ha arịrịọ ha rịọrọ ya bụ ị rụrụ ụlọ akwụkwọ ogo dị elu na ya bụ mpaghara tinyere ịrụtopu ọrụ ngo gọọmenti jigasi n’aka na council ime atọ mejupụtara agbụrụ Kalabari ethnic group nke gụnyere okpuru ọchịchị ime obodo Degema, Asari Toru, yana Akuku Toru.