Otu nwaanyị ana ebo ebubo na o ji ọgwụ akpọrọ poison were gbuo onye sitere na ezinụlọ di ya na mba Brazil anwụọla n’ụlọ mkpọrọ.
Written by admin on February 14, 2025
Nwa afọ mba Brazil bụ nwaanyị ana ebo ebubo na o ji ọgwụ poison akpọrọ arsenic laced bu nke o tinyere na achịcha bekee bụ cake n’ụbọchị ekeresimesi chọọ ikpochapụ ndị ezinụlọ di ya abụrụla onye ahụrụ ka ọ tọgbọrọ n’ozu n’ụlọ mkpọrọ. Ebe ndị uwe ojii na atụ anya na nwaanyị ahụ ejirila aka ya were gbuo onye ya.
Deise Moura dos Anjos gbara afọ iri anọ na abụọ ka a malitere ikpe ya kemgbe ọnwa January maka ebubo na ọ nọrọ n’abalị fotara ụbọchị ekeresimesi were gbuo mmadụ atọ n’ime ndị ezinụlọ di ya site na nje poison nke o tinyere na achịcha ma chọkwaa igbu mmadụ atọ ọzọ.
Ndị ahụ niile bụ ndị tara achịcha ahụ e mere nnyocha sitere n’aka ndị ọkachamara akpọrọ forensic experts wee chọpụta na e tinyere nje poison n’ime ntụ flour ejiri mee ya.
Ndị uwe ojii nọkwa na-eme nnyocha ọzọ ka a mara ma aka ya ọ dịkwa n’ọnwụ nke nna di ya bụ onye nwụrụ n’ọnwa Septemba gara aga.