Ndị uwe ojii na Anambra Steeti anwụchiela otu nwoke maka iji mma were magbuo nwanne ya nwoke.
Written by admin on February 17, 2025
Aka ndị uwe ojii Anambra State Police Command akpatala otu nwoke e nyere aha ya dịka Christian Ndubuisi maka ebubo na o ji mma were magbuo nwanne ya nwoke nke tọrọ ya n’oge ha na-enwe esemokwu.
Ya bụ njinji bụ nke cp Ikioye Orutugu ji ọkwa Commissioner ndị uwe ojii na state ahụ kọwara dịka nke na awụ akpata oyi ma kpọọ oku ka a chọta ụzọ ka mma aga esi na edozi esemokwu ọbụla dapụtara na state ahụ.
N’otu akwụkwọ ozi pụtara ihe taa bụ ụka ka onye mmekọrịta ọhaneze nyere ndị uwe ojii na Anambra Steeti bụ sp Tochukwu Ikenga bụ ya kwupụtara mwuchi nke Ndubuisi na mpaghara 33 Divisional headquarters ụnyaahụ bụ Saturday ozugbo ha nwetachara ozi banyere ogbugbu nke nwa amadi ahụ.
SP Ikenga kọwara na ya bụ ihe mere n’oge mmadụ abụọ ahụ nwere nghọtahe bụ oge nwa amadi ahụ ha ji eji ugbua kuwara ololo bootle ma kụọ ya n’isi nwanne ahụ tọrọ ya.
N’oge ahụ ka e mere ngwa ngwa bụrụ ya gaa n’ụlọ ọgwụ bụ ebe dibịa bekee nọrọ kwuo na ọ bugoro onye nwụrụ anwụ.