Mba United Kingdom akpọla oku ka amara ihe e mere ngwa ngwa ma kwụsị ọgba aghara ahụ na-ada na mba Democratic Republic of Congo
Written by admin on February 24, 2025
Mba United Kingdom akpọla oku ka amara ihe e mere ngwa ngwa ma kwụsị ọgba aghara ahụ na-ada na mba Democratic Republic of Congo dịka otu ndị agha M23 Rebels group kana akpọ ekwo nkụ na esi agụgo na ọwụwa anyanwụ mba ahụ. Mba UK kwuru na Congo yana ogbo ha bụ Rwanda ga asọpụriri oke ala ha dịka mba kwụgoro n’onwe ya.
N’otu akwụkwọ ozi bịara ụnyaahụ bụ ụka ka onye ji ọkwa odeakwụkwọ mba UK nyere ihe ndị na-eme n’obodo ọzọ bụ David Lammy kpọrọ oku ka mba ndị ahụ e nwere n’ala ndị isi ojii mara ihe ha mere iji weta ọgba aghara ahụ n’isi njedebe.
Ozi sitere n’aka ndị ọkachamara nke otu United Nations kwuru na ndị agha M23 Rebels nke ọka n’ọnụ ọgụgụ ha bụ ndị agha mba Rwanda kariri puku anọ ewegharala ọnọdụ n’obodo abụọ kacha bue ibu na ọwụwa anyanwụ mba Democratic Republic of Congo bụ ebe jupụtara na akụ Chinyere dị n’ime ala.
Mba UK kpọrọ ya bụ oku ka asọpụrụ mba DR Congo dịka obodo kwụrụ n’onwe ya ma gbatara ndị ahụ gbara ọsọ ọgụ na mbụ ahụ gaa n’obodo ndị didobere ha nso dịka mba Burundi yana Uganda bụ kariri puku ise ọsọ enyemaka.