Commissioner ndị uweojii na Enugu State bu CP Mamman Bitrus Giwa, ezigala ozi ekene Easter gara ndị uka Kristi nile nọọ na State a.
Written by Onyinye on April 18, 2025
Commissioner ndị uweojii na State a bu CP Mamman Bitrus Giwa, ezigala ozi ekene Easter gara ndị uka Kristi nile nọọ na State a, ma rịọ ha ka ha merube yabu mmemme Easter n’ụzọ nke Kristi onye bu ịsị ahụrụ kwaba okpu.
Ọ kọwara oge Easter dika oge ihunanya, ịchụaja nakwa ikwalite okwukwe, dika ọ kpọkuru ụmụ afọ State a ka ha nabata udo, nwe mmụọ ọmịiko ma nwe ihunanya n’oge mmemme a.
CP Giwa, kwekwara ụmụ afọ State a nkwa na ndi uweojii na agba mbọ iji hụ na enwere ezi nchekwa zuru oke n’oge Easter a ma gafe kwa ya.
Ozi sitere n’aka onye mmekọrịta ohaneze nyere ndị uweojii na State a bu SP Daniel Ndukwe, kọwara na CP Giwa nyere ndị nile bu Area Commanders, Divisional Police Officers nakwa Heads of Tactical and Operational Units ntụziaka ka ha gba mbọ iji hụ na ha webatara ọgụgụ isi nakwa akụrụngwa eji arụ ọrụ nke dị n’aka ha.
Onye Commissioner ahụ gara n’iru gwa ndị Supervisory officers ka ha gba mbọ weputa atụmatụ bu nke ha ga eji weputa ndị mara ihe ekwe n’akụ iji hụ na ha chekwabara ndụ nakwa ihe ndị mmadụ nwere.
CP Giwa rịọkwara ụmụ afọ State a ka ha gba mbọ debe iwu na achịkwa State a ma muru anya k’azu, dika ọ rịọrọ ha ka ha kpọturu ndị uweojii mgbe obula ha chụpụtara ihe dị agha na gburugburu ha site n’akara gbatagbata ndị uweojii bu 080-32-00-37-02 ma ọbu 080-86-67-12-02.