Ụlọ akwụkwọ Ibrahim Badamasi Babangida University nọ n’iru uju dika eji mma magbuo otu nwata akwụkwọ na mahadum ahụ.
Written by Onyinye on June 23, 2025
Ụlọ akwụkwọ mahadum nke Ibrahim Badamasi Babangida University IBBUL nọ n’iru uju dika ozi kọwara na onye ana enyo enyo na ọ bu onye ori ji mma magbuo nwata akwụkwọ nọ 200 level n’ụlọ akwụkwọ mahadum ahụ.
Yabu ọdachi bu nke tinyere ụlọ akwụkwọ mahadum ahụ na gbagharia, bukwa nke kpaliri oke echichi gbasara nchekwa ụmụ akwụkwọ na mpaghara ahụ.
Onye ji anya hụ ihe mere kọwara na nwata akwụkwọ ahụ enyere aha ya dika Jafar bu onye awakporo n’ike, dika onye ahụ ana enyo enyo ji mma magbuo ya ma rie mbọmbọ ọsọ.
Ndị uweojii na Niger State mere ka nkea puta ihe n’ozi ha wepụtara, dika ha mekwara ka amata na ezigala ụfọdụ ndị uweojii n’ebe ahụ iji nye aka ma gba mbọ hụ na ụdọ dị na mpaghara ahụ.
Ha gara n’iru mee ka amata na ha amalitela nyocha dika ha kwere nkwa ikpụpọ onye aka ya dị n’ọnwụ nwata akwụkwọ n’ụlọ ikpe ngwa ngwa ha mechara nyocha ha.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.