Ndị ndu otu BRICS nwere nzukọ ụnya bu Sunday gbasara amuma mwebata tarifu nke President Donald Trump na eme.
Written by Onyinye on July 7, 2025
Ndị ndu otu BRICS nwere nzukọ na Rio de Janeiro ụnya bu Sunday ma dọọ aka na ntị na tarifụ mbubata onye isi ala US bu President Donald Trump, na-enweghị isi nwere ike imebi akụ na ụba mba ụwa.
Ha kwupụtara nchegbu ha banyere ịrị elu nke tarifu nakwa usoro na-abụghị nke tarifụ bu nke na-agbagha ahia ma buru nke na ekwekọghị n’iwu WTO, otu ahụ mere ka nkea puta ihe dika ha na atugara World Trade Organisation aka.
Mba iri na otu sonyere na nzukọ ahụ tinyekwara mba Brazil, Russia, India, China nakwa South Africa, bu ndi nọchitere anya ihe dịka ọkara ndị bi n’ụwa nakwa percent iri anọ nke mmepụta akụ na ụba nke mba ụwa.
Otu ahụ bu nke nwere ọtụtụ nekewa, mana ha biakọrọ ọnụ n’ihe gbasara amụma onye isi ala mba US nakwa
nkwụsị-mmalite agha tarifu ya.
Otu BRICS kọwara tarifụ ndị dị otu ahụ dịka nke iwu na-akwadoghị, ma na eyi egwu ịbelata azụmahịa zuru ụwa ọnụ, na-akpaghasị usoro nkesa akurungwa zuru ụwa ọnụ, na ewebata ejighị n’aka n’ime ọrụ akụ na ụba nakwa azụmahịa nke mba ụwa.
N’ọnwa April, President Trump yiri egwu gara ndị kwụ ya n’azu nakwa ndị na emegide ya n’inye ha ntaramahụhụ, dika ọ dọrọ aka na ntị na ha ga-atụnye ndị mmekọ ụtụ otu bere so ma ha nwere ezi mkwekọrịta na abalị mbu n’ọnwa August.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.