Onye Isi Ala Nigeria Agwaala Ulo Nzuko Omebe Iwu Ogogo Etiti Maka Nkeputa Ndi Uwe Ojii Na Ogogo State

Written by on February 26, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Onye isi ala anyi bu President Bola Ahmed Tinubu ayiola ndi omebe iwu ulo nzuko ogogo etiti akporo National Assembly ka ha kpatugharia aka na iwu ala anyi ma tinye ndi uwe ojii State Police dika otu na ime mbo ochichi ya na agba megide ihe aka mgba nchekwa ala anyi a.

President Tinubu yoro ayiyo a na abali putara taata bu Thursday na ogbako interfaith breaking of fast ochikobara ndi omebe iwu sitere ulo nzuko ukwu Senate na obi onye isi ala dina Presidential Villa, Abuja.

President Tinubu kowara nke a dika ihe biara na oke mkpa iji nye aka chekwa ohia na uzo niile megide ndi ala adighi mma na akpa ike ojo na ala anyi ma wepuru umu afo Nigeria ujo na aru.

Okwara ariri megide agha isi ekwe onwu bu Terrorism, nke osochi egbu bu Banditry nakwa ajo onodu nchekwa ndi ozo na ala anyi a.

Onye isi ala anyi toziri habu ndi omebe iwu maka mbo ha nyere ibu agha megide ajo onodu nchekwa ma kwe nkwa sina ogaghi eji ezi nkwado a mere ihe nleghara anya.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited