Ego Ana Ere Ikuku Mmuo Gas Eji Esi Nri Ariala Elu Oji Na Nigeria
Written by admin on March 5, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Agha ahu mba United States of America nakwa Israel jikoro aka ebu emegide mba Iran na mpaghara Middle East ebutela ajo onodu elu oji nke onu ego ana ere ikuku mmuo eji esi ihe bu Liquefied Petroleum Gas LPG amakariri dika Cooking Gas na mba uwa.
Nke a bu dika onu ego yabu ikuku mmuo ji per cent iri na ato rikwuo eli oji nyere ka odibu tupu ubochi Saturday gara aga mba America nakwa Israel malitere ibuso Iran agha.
Na izu uka gara aga ka erere metric tones iri abuo ikuku mmuo Cooking Gas na ala anyi a bu Nigeria na onu ego di nde Naira iri na ise na uma iri iteolu na ise yabu; 15 point 95 Million Naira mana onorogo ka odi na izu uka a ria elu oji gbago nde Naira iri na asato nke putara 18 Million Naira.
Nke a mere na otu kilogram yabu Cooking Gas sitere na otu puku Naira erere ya na izu uka gara aga gbago otu puku na nari Naira ano ka odigodu na izu uka a.
Onodu a na egosi na obu per cent iri ano ka ego ikuku mmuo gas eji esi ihe ji ria elu oji maka otu kilogram na ala anyi a kwere maka yabu agha na ada na mpaghara Middle East bu nke butegoro uzo agaghi aga na nruputa nakwa nkesa mmanu gunyere ikuku mmuo gas na mba uwa.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.