Oku Ogbugba Akpaala Ike Ojo Na Isi Ulo Olu Onye Isi Ndi Olu Oyibo Ogogo Etiti Ala Anyi
Written by admin on March 9, 2026
by Maduabuchi Onwe
Ihe mberede oku ogbugba atapiala ulo olu onye isi ndi oru oyibo na ogogo etiti ala anyi akporo Head of Service dina Abuja bu isi obodo Nigeria.
Yabu oku ogbugba ka ozi mere ka amata na omalitere oge ona aku elekere asaato nke ututu taata bu Friday na ogige ulo olu onye isi ndi oru oyibo ogogo etiti ala anyi.
Kosiladi, ufodu ndi na aru na yabu ulo olu emela ka amata na ulo olu mgbanyu oku ogbugba noo ugba wee na eme ihe ike kwere ha imenyu yabu oku ogbugba.
Ha gakwara na iru mee ka amata na ihe butere yabu ihe mberede oku ogbugba aka edochabeghi anya ka odi na oge ndeko akuko a.
Iga echetazi na ulo olu mgbanyu oku ogbugba na Abuja bu isi obodo Nigeria kana agba mbo igbanyu yabu oku ogbugba na oge edeko akuko a.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.