EFCC Anwuchiela Onye Ana Enyoenyo Na Ojoro Ala Na Enugu State

Written by on March 10, 2026

by Chidimma Kama

Ndị ụlọ ọrụ Economic and Financial Crimes Commission na Enugu State, anwụchiela otu nwoke enyere aha ya dịka Ifeanyi Mba, kwere maka ebubo banyere wayo ala ọnụ ego ya dị nde naira ịrị yabụ ₦10 million naira.

Ụlọ ọrụ ahụ mere ka nkea pụta ihe n’ọwa ozi mmekọrịta ọhaneze ha ụnya bụ Monday.

Ụlọ ọrụ EFCC gara n’iru kọwaa na ha nwụchịrị nwa amadi ahụ ana enyo enyo kwere maka akwụkwọ mkpesa ha nwetara bụ nke boro ebubo na ya kwụrụ nwa amadi ahụ ana enyo enyo ego ahụ akpọrọ aha ya maka otu ala dị na Plot 677 Owo/Premier Layout, Ogui Nike Community dị na Enugu State, dịka ọchọpụta na onye ọzọ na arụ ọrụ n’ala otu ala ahụ.

N’okwụ ya ka onye ahụ gbara akwụkwọ mkpesa kọwara na oge ọ kpọtụrụ nwa amadi ahụ ana enyo enyo banyere ihe ọhụrụ, ọ gwara ya na emere ka ọ mata na ọbụ gọọmenti nwe ala ahụ.

Kosiladị, mbọ niile onye ahụ gbara akwụkwọ mkpesa gbachara ka onweghachita ego ya kpọchara afọ n’ala kwere maka na ọ naghịzị enweta ozi site n’aka nwa amadi ahụ ana enyo enyo.

Dịka nyocha mbụ ụzọ ndị EFCC mere chọpụtara na onweghi Layout ọbụla bụ aha Plot 677 Owo/Premier n’ime ala ndị ahụ ọbụ gọọmenti nwe, dịka ha gara n’iru mee ka amata na Owo nakwa Premier bụcha layouts abụọ kwụrụ n’onwe ha.

Ha gakwara n’iru mee ka amata na aga akpụpụ nwa amadi ahụ ana enyo enyo n’ụlọ ikpe ngwa ngwa ha mechara nyocha ha.

Na akụkọ ọzọ dịka ibe ya, ozi kọwara na ụlọ EFCC nwụchiri ndị ọzọ bụkwanụ nke nọ n’aka Enugu Zonal Directorate.

Dịka ha mere ka amata na n’ime ọnwa January na gọọmenti Enugu State chọtara ego dị
Otu ijeri naira na ụma ịrị abụọ na asatọ yabụ ₦1.28 billion naira, site n’aka ụlọ ọrụ Sujimoto Luxury Construction Limited, site na nyocha ụlọ ọrụ EFCC mere banyere ebubo na ụlọ ọrụ ahụ bufere ego ekwesịrị iji rụọ ụlọ akwụkwọ Smart Green School na mpaghara niile enwere na State a.

Yabụ ego a chọrọ bụ ọkara ego akwụrụ ụlọ ọrụ ahụ maka yabụ ọrụ ngo ka ozi kọwara na ha gbaghapụrụ ya ma ọbụ na ha arụghị ya chacha, bụ nke enyefegoro n’aka gọọmenti State a n’ụlọ ọrụ EFCC Enugu Zonal Office.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited