Otu Nwoke Amaala Umu Ya Nwaanyi Abuo Elu Na Ike Na Enugu State

Written by on March 13, 2026

by Chidimma Kama

Aka ndi uwe ojii ala anyi na Enugu State akpatala otu nwoke gbara afo iri ano na ise enyere aha ya dika Eugene Obinna Ikeoche maka ebubo ima umu ya ndi nwaanyi abuo elu na ike na Ezeagu LGA nke State a.

Habu ndi uwe ojii mere ka amata na obu ndi olu ha sitere Iwollo Police Division na Ezeagu LGA sitere na njiko aka na olu ndi nche Neighborhood Watch obodo ahu nwuchiko nwoke a ana enyoenyo.

Na okwu ogwara ndi nta akuko na ogige Police Command’s Headquarters dina mpaghara GRA nke isi obodo Enugu ka Commissioner habu ndi uwe ojii na State a bu CP Mamman Bitrus Giwa mere ka amata na ndi uwe oji choputara agwa ekperima a kwere maka mkpesa onye a ana enyoenyo mere sina nwa ya nwaanyi gbara afo iri na asaa na efu efu.

Yabu Commissioner ndi uwe ojii gwara ndi nta akuko na obu oge achoputaziri yabu nwa ya nwaanyi na efu efu ka nwagbobia ahu mere ka amata na ya kwachara anya gbapu na ulo kwere maka na nna ya ji akwam iko na ike cho inapu ya ndu ya.

Nwagbobia a kowaziri na nna ya ahu bughariri onodu ma jide nwanne ya nwaanyi nke obere gbara afo iri na abuo mere ihe akwam iko kwere maka mgbapu ahu ogbapuru na ulo.

CP Giwa kwuputara na nwoke a aka kpatara gwara ndi uwe oji na obu eziokwu na ya mara habu umu ya ndi nwaanyi abuo elu na ike kama na obu ekwensu kwanyere ya ikpa yabu agwa nwankita.

Yabu onye isi ndi uwe ojii kowara na nnyocha na aga na iru nke oma banyere onodu a dika okwere nkwa ikpuga nwoke a ulo ikpe ma emecha ya nnyocha ka yabu eze ka udele gaa gwaa iwu ala anyi mmuo chiri ya ozo.

#

Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited