Oku Electric Adogbuola Otu Onye Ekperima Na Enugu State
Written by admin on March 18, 2026
by Maduabuchi Onwe
Oku electric adogbuola otu nwoke aka enyebeghi aha ya ebe ogara izu ori udo oku na mpaghara Independence avenue nke dina lndependence layout na isi obodo Enugu state.
Nke a putara ihe na ozi onye isi ngalaba mgbasa ozi nyere ulo olu nkesa oku Enugu Electricity Distribution Company EEDC bu maazi Emeka Ezeh nyefere ndi nta akuko na ubochi Tuesday na Enugu.
Maazi Ezeh na nkowa ya mere ka amata na ha huru ozu yabu onye ori na ututu Tuesday na ogige obi ume nke ulo olu EEDC nke dina mpaghara Akonobi nke state a.
Ogakwara na iru mee ka amata na yabu onye ori mmiri fIara na eze nakwa ndi otu ya atoputago eriri oku electric ahu abuo tupu yabu oku adogbuo ya na eleghi anya na azu.
Na ikpazu ka okpokuziri ndi oru nchekwa state a ka ha muru anya ka azu iji kwusi kpam kpam onodu ndi mmadu ji ebi udo oku electric kwa ubochi na Enugu state.
Iga echetazi na nnyocha ulo olu na ahu maka ikesara ndi mmadu oku electric na Nigeria na egosi na ogige obi oku ndi ori mebigoro na afo 2025 di otu nari, iri ato na otu na ala anyi a.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.