Ndi Uwe Oji Egosila Otu Onye Ekperima Ihe Oku Ji Nti Oke Eme Na Delta State

Written by on March 19, 2026

by Chika Nwazu

Otu onye ana atụ anya na ọ bụ onye ntọri mmadụ anwụọla ebe onye otu ya ọzọ nwetara ihe mmerụ ahụ n’oge hana ndị uwe ojii nke Issele-Uku Police Division nke onye du ha bụ CSP Aderemi Badiru na akwakorita mgbọ.

Emere ka amata na ndị agha, ọrụ nche Vigilante yana ndị na-agba nta nọrọ n’oge ahụ nyere ndị uwe ojii aka.

Ndị uwe ojii nọrọ n’oge a zọpụta mmadụ atọ n’aka ndị ntọri ma nwuchie otu nwoke gbara afọ iri abụọ na abụọ ana atụ anya na ọ bụ onye ntọri bụ Ahmadu Hassan ma napụ ya egbè Ak 47 nke mgbọ egbe anọ dị n’ime ya.

Ihe ndị a ka emere ka ọ pụta ìhè site n’ọnụ SP Bright Edafe n’okwu ọ gwara ndị nta akụkọ na ubochi Wednesday na Warri dina Delta State.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited