Ulo Ikpe Ekwuputala Ikikere Umu Afo Nigeria Iseta Ndi Uwe Ojii Ebe Obuna Ha Noo Olu Na Ala Anyi
Written by admin on March 19, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Ulo ikpe Federal High dina Warri nke Delta State akabiela ikpe ma kwuputa na umu afo Nigeria nwere ikikere iwu iseta ndi uwe ojii noo olu na udi nwa bekee kporo Right To Record Police Officers na mpaghara niile nke ala anyi a.
Ozi nkabi ikpe a putara ihe unya bu Wednesday dika eburu uzo kabie ya nwanne unya bu Tuesday site na onu Justice H. A. Nganjiwa bu okaikpe noro na isi akwukwo ikpe agbara megide habu ndi uwe ojii ala anyi.
Na akwukwo ikpe nke obu onye enyere aha ya dika Maxwell Uwaifo gbara ka ndi zara onu ha na ya gunyere: ndi uwe ojii Nigeria Police Force, ulo olu na elekota odimma habu ndi uwe ojii bu Police Service Commission, onye isi izugbe ha na okwa Inspector General nakwa okaiwu izugbe ala anyi na okwa Attorney General of the Federation.
Justice Nganjiwa kabiziri ikpe ma kwenyere na ayiyo niile nwa amadi a gbara akwukwo yoro megide ndi uwe ojii dika odara habu ndi uwe ojii nra ego di nde nari ise yabu; 5 Million Naira ego iti aka na obi maka mmeto ikikere onye a gbara akwukwo.
Justice Nganjiwa gara na iru daa ndi uwe oji nra ego ozo di nde Naira abuo nke putara 2 Million Naira dika ego nwa amadi a mefuru na ihe banyere yabu ikpe, nke mere mgbakota onu nra ego okaikpe a dara ndi uwe ojii buzi nde Naira asaa.
Okaikpe a mere ka amata na ndi uwe ojii gana eyiriri akara aha ha gosiri nke oma na udi visible name tags, nakwa akara Force Numbers ma ha puta olu, ebe odoro aka na nti ka habu ndi uwe ojii kwusi idi na eyija, inwuchiko ma obu inabu ihe obuna nwa afo ala anyi ji eseta ha ma ha noro na iru olu.
Ndi nta akuko nwetaziri ozi na Maxwell Uwaifo gbara akwukwo na ulo ikpe ma yoo ulo ikpe ahu ka onye nkabi ikpe nkowa banyere ma umu afo ala anyi ha enwere ikikere iseta ndi uwe ojii na ebe obuna ha noo olu na Nigeria yanakwa ma ndi uwe ojii ha enwere ikikere iyija ma nwuchiko nwa afo ala anyi setara ha ma elegara anya na mmeto ndi uwe ojii metoro ikikere onye a gbara akwukwo kwere maka na osetara ha ebe ha noo olu.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.