Ndi Uwe Ojii Anwuchiela Ndi Ekperima Na Akpa Ike Ojo Na Anambra State
Written by admin on March 23, 2026
by Maduabuchi Onwe
Ndi uwe oji ala anyi na Anambra state anwuchiela mmadu ato ana enyo enyo na habu ndi ori nakwa ndi otu nzuzo na state ahu na odi nso a.
Nke a putara ihe site na ozi onye mmekorita ohaneze nyere ndi uwe oji ala anyi na state ahu bu SP Tochukwu Ikenga nyefere ndi nta akuko taata bu Monday abali iri abuo na ato nke onwa March afo a bu 2026.
SP lkenga gakwara na iru mee ka amata na anwuchiko ndi ahu biara ngwa ngwa ha nuchara kepu kepu na onwere ndi ala adighi mma na aga ije agwo na mpaghara digasi ichiche nke state ahu.
Yabu onye mmekorita ohaneze mekwaziri ka amata na obu na mpaghara Ogidi, nke dina ldemilli North local government area nke Anambra state ka ndi uwe oji ala anyi na Awkuzu nwuchiri habu ndi omekome na abali iri abuo na otu nke onwa March afo a bu 2026.
Habu ndi omekome gunyere: Francis Chukwuka Anene gbara afo iri ano na isii, Emmanuel Obi gbara afo iri abuo na iteolu tinyekwara okoye Chinonso gbara afo iri ato na ise bucha umu afo Anambra state.
Kosiladi, ihe ndi anaputara habu ndi omekome gunyere: egbe pistols abuo, mgbo egbe ano dicha ndu, nakwa otu akwukwo ID card bu nke adigboroja.
Iga echetazi na nnyocha mbuzo emegoro na egosi na ndi ahu abugoro iche na izi ori na state ahu okachasi mpaghara ogadi nke ldemilli North local government area.
Na ikpazu ka onye commissioner ndi uwe oji ala anyi na state ahu bu CP lkioye Orutugu kwere oha obodo state ahu nkwa iga na iru ibu agha megide ndi ala adighi mma na Anambra state.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.