Ndi Uwe Ojii Adila Njikere Ibu Agha Megide Ndi Okpu Ugboala Na Anaghi Enwe Nrube Isi Na Iwu Na Achikwa Okporo Uzo Na Delta State
Written by admin on March 23, 2026
by Maduabuchi Onwe
Ndi uwe oji ala anyi na Delta State ekela nkwucha inwuchiko ndi obuna na anaghi agbasoro iwu na achi okporo uzo na state ahu ma nye ha ntaramahuhu kwesiri ha.
Nke a putara ihe site na ozi osote onye commissioner ndi uwe oji ala anyi na state ahu bu DCP Olumuyiwa Adejobi nyefere ndi nta akuko taata bu uka na state ahu.
DCP Adejobi gakwara na iru mee ka amata na ha ekeputago ulo ikpe asaa gana elebanya na okwu gbasara ndi obuna anwuchiri kwere maka inupu isi gara iwu na achi okporo uzo na state ahu.
Kosiladi, ha gakwara na iru kwuputa na ndi ha gana anwuchi gunyere: ndi na enweghi akara ugbala, ndi na enweghi akwukwo ikikere na egosi na obu ha nwee ugboala, ndi na agba wam wam na okporo uzo nakwa otutu ihe ndi ozo.
Na ikpazu ka ha mere ka amata na nke a so na mbo ha na agba ikwusi oke ihe mberede okporo na state ahu.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.