Ahutala Uzo Agaghi Aga Site Na Igwe Ndi Nchekwa Na Kaduna State Dika Akpuputara Mallam Nasiru El-Rufai Ulo Ikpe
Written by admin on March 24, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Anorola taata bu Tuesday huta ajo onodu uzo agaghi site na igwe ndi nchekwa na ulo ikpe Federal High Court dina isi obodo Kaduna State dika akpupuru onye ahu jitopuru okwa Governor State ahu bu Mallam Nasiru El-Rufai ulo ikpe taata.
Mallam El-Rufai ka ulo olu ala anyi ahu na ebu agha emegide mpu na aru nakwa nruru aka ndi ozo akporo Independent Corrupt Practices and Other Related Offences Commission ICPC kpugara ulo ikpe taata kwere maka ebubo mpu na aru ndi gunyere: imeto okwa ochichi, agwa ekperima ego nakwa ajo ihe ndi ozo.
Ka osiladi, ka oruru taata ka eji igwe ndi nchekwa kpuru yabu onye jibukwara okwa Minister huru maka FCT Abuja na oge ochichi Chief Olusegun Obasanjo wuchie ulo ikpe yana onye ozo ana ebo yana ya ebubo enyere aha ya dika Amadu Sule.
Ndi nchekwa oje na mmuo Department of State Services DSS soo kpuga yabu El-Rufai ulo ikpe juziri ndi nta akuko ohere ibanye na ime ulo ebe ikpe nwa amadi a ana enyoenyo na aga na iru.
Ndi nchekwa ahu gakwara na iru kpochie uzo megide njem ugboala na mpaghara ebe ulo ikpe ahu didebere Old Nigerian Defence Academy.
Iga echetazi na obu ulo olu ala anyi ahu na ebu agha emegide ima ego nakwa akuluba ohaneze ndi Nigeria mmiri ojo bu Economic and Financial Crimes Commission EFCC buru uzo noro na abali iri na isii nke onwa February gara aga nwuchie Mallam Nasiru El-Rufai na ebubo agwa ekperima ori ego, ebe anoro na abali iri na asato nke yabu onwa gara aga nara ya na akaebe.
Ndi olu nke ICPC noziri na aka nke ha ngwangwa anara ya na akaebe nwuchiko nwoke a ana enyoenyo buzi nke ha jichiri ya ruo taata akpuputara ya ulo ikpe.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.