Ochichi Etiti Ala Anyi Akatola Ihe Obuna Bu Echichi Eze Ndigbo Ozo Na Mba Ofesi
Written by admin on April 10, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Govt etiti ala anyi akatola ya bu ajo onodu elu oji nke echichi Eze Ndigbo ana ahutagasi na aka umu afo obodo anyi a bina mba ofesi.
Nke a ka ochichi etiti kowara dika ite unyu na iru ala anyi ma buru nke nwere ike ibute ajo onodu amaghi kwuru ala anyi a nyere mba ndi ozo nakwa ogbaghara obodo na ibe ya.
Ihe ndi a putara ihe unya bu Thursday site na ozi onyefere ndi nta akuko bu onye enyemaka puru iche na ihe metutara nzikorita ozi nakwa mgbasa ozi ogbaru ohuru nyere Amb Bianca Odumegwu-Ojukwu ji okwa Minister ogo nta ala anyi na ahu maka mba ofesi bu Dr Magnus Ezeh.
Na ozi a ka govt etiti noro kowa na ona aruko olu nyere otu Ohaneze Ndigbo Worldwide nakwa otu jikoro ndi eze odinala na mpaghara South East iji kachapu ihe obuna bu echichi Eze Ndigbo na ebe na abughi ala Igbo.
Dr Magnus Ezeh gwara ndi nta akuko na obu na nzuko Imeobi otu Ohaneze Ndigbo were onodu unya na isi obodo Enugu ka Amb Bianca Odumegwu-Ojukwu noro kwuo okwu ndi a.
Amb Odumegwu-Ojukwu kowara na obu ezi a na ndi Igbo nona mba ofesi na adi na achikoba ogbako mmeme ikwalite omenala nakwa njirimara ala Igbo kama na iwebata echichi Eze odinala Igbo na habu mba ofesi ebutela ogbaghara ugboro ugboro na etiti obodo ha nogasi nakwa habu mba ofesi ha bigasi.
Na nke ya ka onye President General otu Ohaneze Ndigbo Worldwide bu Sen John Azuta Mbata kwuputara nkachapu ihe obuna bu echichi Eze Ndigbo na ebe na abughi ala Igbo.
Sen Azuta Mbata mere ka amata na otu Ohaneze Ndigbo agaghizi anabata echichi odinala Igbo obuna ozo echiri na mpuga ala Igbo.
Ozi mere ka amata na ihe banyere echichi Eze Ndigbo na mba ofesi noro na onwa July afo 2025 bute ogbaghara megide umu afo Nigeria na mba Ghana, ebe ajo onodu a noziri na ebe ngwucha onwa March gara aga bute ogbaghara na mba South Africa megide umu afo ala anyi bina mba ahu, nakwa ajo onodu ozo ahutagoro na mba ofesi ndi ozo kwere maka otu ihe a bu ichi Eze Ndigbo na habu mba ofesi.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.