Ochichi Enugu State Ebinyela Aka Nkwekorita Maka Nkesa Oku Electric Gaara Ufodu Obodo Na State A

Written by on June 12, 2026

by Oluchi Okafor-Iloh

Govt Enugu state ebinyela aka nkwekorita nyere ulo olu ano na aruputa ikikere oku ogbaru ohuru maka iweta oku electric gara ime obodo ano na ogbonta vote ato enwere na state a site n’ usoro akporo European union and German government funded initiative.

Yabu nbinye aka nkwekorita bu na ubochi Wednesday ka owere onodu n’oge mmeme ndi otu Renewable Energy development for state electricity market REDSEM nwere nke obu ochichi state a na njiko aka ulo olu Nigeria Energy support programme and German development agency GIZ chikobara na ulo oriri na onunu Hotel presidential dina isi obodo Enugu.

Ufodu Ime obodo ndi ahu ga erite erere ikike oku electric a gunyere:Okpatu, ugbawka,Agwunta nakwa ljabe. Ebe ulo olu nkesa oku electric a ahotara gunyere: Darway coast Nigeria Ltd,Sea solar energy Ltd nakwa ulo olu abuo ndi ozo.

N’okwu ya n’oge mmeme a,Ka onye isi oche ulo olu Enugu state electricity regulatory commission EERC bu Mazi chijioke Okonkwo noro me ka amata na nkea bu mmalite ikesa oku electric gara ime obodo ano ahu bu ndi na ahutabeyi oku electric anya na mbu nke obu site na nkwado ochichi mba Germany.

Mazi Okonkwo kowara na ego nkwado a ga ezu izuta akuru ngwa nile achoro maka iguzobe yabu obi oku mini grids nke ga eziputa opekata mpe ya buru nari kilowatts abou maka otu ime obodo.

Na nke ya Ka onye head of component, sustainable Energy investment na ngalaba GIZ-NESP bu Engr Joshua Garba, onye commissioner na ahu maka ume oku na aku imela bu Hon Franklin Enyinna,nakwa onye ji okwa Managing Director nakwa Chief Executive Officer nke ulo olu Enugu state Electrification Agency noro too ochichi Enugu state maka ibu ndi mbu ga etinye atumatu Nigeria electricity Act n’olu site n’ usoro state electricity market.

Governor Peter Ndubuisi Mbah nke onye nochitere anya ya bu ode akwukwo nyere ochichi state a bu prof chidiebere onyia mere Ka amata na njiko aka na olu a dabara na atumatu ochichi ya ji na aka ime Ka Enugu state nwe otutu akuru ngwa ogbara ohuru.

K’osiladi, Ka onye Chief Executive Officer nyere ulo olu sea solar energy Ltd bu Mazi Chibueze Ekeh jizi aha ulo olu ndi ozo kwuputa si na olu ngo a ga n’enye oku electric anyu anyu ma buru nke ga akwalite ezi obibi ndi , nchekwa tinyekwara onodu akuluba nyere ime obodo ndia.


Discover more from Owelle FM

Subscribe to get the latest posts sent to your email.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

Discover more from Owelle FM

Subscribe now to keep reading and get access to the full archive.

Continue reading

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited