Otu Ndorondoro NDC Ekwuputala Njikere Ituru Ugo Na Ntule Aka Okpuru Ochichi Ime Obodo Na Enugu State
Written by admin on June 15, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Otu ndorondoro ochichi Nigeria Democratic Congress NDC na Enugu State nke Dr. Johnpaul Anih nona isi ya dika onye isi oche emela ka amata ezi onodu siriri werere nke nnyocha ulọ olu Enugu State Independent Electoral Commission ENSIEC mere gaara ndi ji okoloto otu ndorondoro a azogasi okwa na ntule aka okpuru ochichi ime obodo gaa ewere onodu na State a na oge na adighi anya.
Na okwu ogwara ndi nta akuko taata bu Monday na isi obodo Enugu ka Dr. Anih mere ka amata na NDC roputara ndi kariri mmadu iri na ano na azo okwa ndi isi oche okpuru ochichi ime obodo nakwa ndi nke kariri nari abuo na iri na azo okwa councillor na yabu local govt elections na akpudobe nso.
Na oge ona akowa yabu ntule aka ochichi dika ihe aga eji nwale onodu okwe ndorondoro gaara ntule aka ochichi izugbe ga ewere onodu na State a na afo 2027 ka Dr. Anih kenere ulo olu ENSIEC maka ihe okowara dika nkwuba aka oto na oge nnyocha ahu, ebe odoziri aka na nti megide atumatu obuna ga abu ogbatuhe gaara yabu ntule aka ochichi.
Nwa amadi a bu onye isi oche otu ndorondoro NDC na Enugu State kwuputara na otu ndorondoro a chikobara ntule aka ochichi ime ulo kwu siriri werere ma buru nke ulo olu ENSIEC gara leta bukwanu ebe anoro roputa ndi a na esonyere na yabu ntule aka okpuru ochichi ime obodo.
Na nke ya ka ode akwukwo NDC na State a bu Dr Sebastine Okafor kwuputara olile anya otu ndorondoro a ime nke oma na yabu local govt elections ma oburu na enweghi nruru aka na ya, dika otoziri ulo olu ENSIEC maka ikeputa gburugburu doro gaara otu ndorondoro ochichi niile na esonyere na ya, ebe onoro na oge ona akowa na otutu ndi Enugu State di njikere igbanwe usoro ochichi na State a, kpokuzie habu ndi bina State a ka ha gaa na iru na ikwado NDC maka mgbanwe ka mma.
Onye nta akuko anyi wetara ozi na obu na abali iri abuo na isii nke onwa September afo a bu 2026 ka ulo olu ENSIEC weputara ichikoba yabu ntule aka ochichi local govt elections na State a.
Discover more from Owelle FM
Subscribe to get the latest posts sent to your email.