Otu Nwoke Egbuola Nne Nna Ya Na Ike Na Obodo Dina Imo State
Written by admin on July 23, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Ndi obodo Azaraowuala dina Emekuku nke Owerri North LGA na isi obodo Imo State abanyela na onodu amaghi kwuru sitere na odachi nke ogbugbu otu nwoke enyere aha ya dika Chukwuebuka Anushiri gburu nne ya ochie bu agadi nwaanyi gbara afo iri iteolu enyere aha ya dika Odoziaku Mary Anushiri.
Odachi a mere kemgbe ubochi Monday gara aga ka akowara na yabu Chukwuebuka gbara afo iri ato na abuo gbuchara nne nna ya ahu ma jiri ihe bekasie aru ya site na ibepu ya ire, egbugbere onu nakwa mkpusi aka ya.
Na okwu ya unya bu Wednesday ka onye ndu ndi ntorobia obodo ahu bu Comrade Chima Onyegbula kowara na onye a ana enyoenyo ji ugboala wuchie na ulo jikoro ezinulo ha, ma rahu na abali ubochi uka gara aga, buzi ebe onoro na agbata elekere ato nke ime abali ahu putara Monday gbuo yabu agadi nwaanyi bu onye mutara nna ya.
Comrade Onyegbula kowara na omere ngwangwa oge onwetara ozi banyere odachi a kpokonata ndi nche vigilante gara nwuchie yabu nwoke kpara agwa ekperima ma nyefe ya ndi uwe ojii.
Na nke ya, yabu unya, ka onye mmekorita ohaneze nyere ndi uwe ojii ala anyi na Imo State bu DSP Henry Okoye gwara ndi nta akuko na odachi a bu eziokwu, mana yabu nwoke nozi na aka habu ndi uwe ojii, dika ha malitegoro nnyocha na odachi a.
