NAFDAC Amalitela Ibu Agha Megide Mmanya Ngwugwu Nakwa Nke Obere Ololo Na Nigeria
Written by admin on July 23, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Ulo olu National Agency for Food and Drug Administration and Control NAFDAC anorola unya bu Wednesday malite na ozuzu oke itinye na olu bu mmachi ire ma obu nkesa ihe obuna bu mmanya na aba na anya ekechiri na ngwugwu na udi sachet alcoholic beverages nakwa ndi nke etinyere na obere ololo na erughi ntu nari mililitries abuo na mpaghara niile dina ala anyi a.
Nke a bu dika ndi olu NAFDAC noro yabu unya wuchie ogige di ichiche enwegasiri na Nigeria ihuna eburu agha megide ire habu mmanya ngwugwu nakwa nke obere ololo.
Ebe ndi ahu ndi olu NAFDAC buru agha megide nke a unya na mpaghara geopolitical zones isii enwere na ala anyi gunyere: ulo ahia, odu ugboala, ogige nnuchara ihe nakwa ebe ndi ozo.
Na okwu ya ka onye Director General yabu ulo olu NAFDAC bu Prof Christiana Mojisola Adeyeye mere ka amata na onyego ndi nruputa nakwa ndi niile odina aka ire ma obu ikesa habu mmanya ngwugwu gunyere nke obere ololo ntuzi aka ka ha mee ngwangwa nyefe habu mmanya nke foro ha na aka.
Prof Adeyeye doro aka na nti sina oke ntarama ahuhu kwu eche onye obuna ozo enwetara habu mmanya ngwugwu nakwa nke obere ololo na aka, ma obu na ulo ahia gunyere ebe nruputa ha na ala anyi a.
