Government Ogogo Etiti Ala Anyi Ekwuputala Uzo Ihe Asaa Ga Egbochinwu Mmadu Inwete Oru Government Na Nigeria

Written by on July 29, 2026

by Maduabuchi Onwe

Government ogogo etiti ala anyi ekwuputala uzo ihe asaa nwere ike igbochi onye obuna na acho oru government inwete yabu oru na ala anyi a bu Nigeria.

Ufodu ihe ndi ahu ka ha gara na iru wee guputagasie dika; inye mmadu ego ka ogotere gi oru government, ihafenyezi akwukwo iji acho oru na aka ndi adigboroja na ebughari onwe ha dika ndi oru government na Nigeria.

Ebe ihe ndi ozo gunyere; inye government ozi na ezughi oke gbasara onwe gi, itenye akwukwo ndi ahu ha na achoghi ma obu nke na enweghi uru obara na akwukwo iji acho oru tinyekwara itenye akwukwo iji acho oru na azu oge na ala anyi bu Nigeria.

Nke a putara ihe site na onu ulo olu federal character commission FCC na ozi ha weputara na owa ozi onya nwudude ha unya bu Tuesday abali iri abuo na asato nke onwa July afo a bu 2026.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited