Aka Ndi Uwe Ojii Akpatala Otutu Ndi Ana Enyoenyo Na Agwa Ekperima Na Enugu State
Written by admin on July 29, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Ndi uwe ojii ala anyi na Enugu State ebuola agha di egwu site na inwuchiko mmadu iri na ano ana enyoenyo na agwa ekperima otu nzuzo nakwa itinye ndi mmadu ura agaghi na anya na ufodu mpaghara enwegasiri na State a.
Na ozi onyefere ndi nta akuko unya bu Wednesday na ogige Police Command’s Headquarters dina isi obodo Enugu ka onye mmekorita ohaneze nyere ndi uwe ojii ala anyi na State a bu SP Daniel Ndukwe mere ka amata na obu na Eha-Amufu dina Isi-Uzo LGA nakwa na Ezeagu LGA nke State a ka aka ndi uwe ojii sitere alaka Anti-Cultism nke ngalaba Violent Crime Response Unit VCRU kpatara ndi a.
SP Ndukwe kowara na anaputara egbe abuo, mgbo egbe dicha ndu ato nakwa ihe ndi ozo ana enyoenyo na aka ndi a anwuchikoro.
Yabu onye Police Public Relations Officer PPRO na Enugu State kowara na nke a sona mbo ndi uwe ojii na agba inogidesi ike na agha mkpochapu hana ebu emegide ndi ekperima na State a.
Okwuputara na obuna abali iri abuo na isii ka aka kpatara ndi a ana enyoenyo, ebe mmadu isii ka anwuchikoro na Ezeagu LGA, mmadu asato ndi ozo adanye na onya habu ndi uwe ojii na Eha-Amufu dina Isi-Uzo LGA.
Na oge ona akowa na nnyocha kana aga na iru ihuna aka kpatachara ndi ekperima ahu nke ka nona oso, ka yabu onu na ekwuru ndi uwe ojii na State a kowara na aga akpuga ha ulo ikpe ma emecha yabu nnyocha ka habu eze ka udele gaa gwa iwu ala anyi mmuo chiri ha ozo.
#####################
