Otu Nwoke Esuola Nwunye Ya Oku Na Ndu Na Kogi State Kwere Maka Nghotahe Ezinulo

Written by on August 17, 2026

by Chika Nwazu

Otu nwoke enyere aha ya dịka Jacob Irewa enwetala onwe ya n’aka ndị uwe ojii Kogi State, maka ebubo na ọ mụnyere nwunye ya bụ Berida Irewo, ọkụ n’oge ha na-enwe esemokwu ezinụlọ na Lokoja bu isi obodo State ahu.

Ihe a mere n’ụbọchị Friday n’ebe a na-akpọ Oworo Estate, Felele, Lokoja. Ndị uwe ojii kwuru na esemokwu ahụ malitere mgbe nwunye ya kpọrọ ụfọdụ efe di ya ọkụ n’enweghị ikike ya, n’ihi na o chere na di ya anaghịzi eyi efe ndị ahụ.

Dị ka ndị uwe ojii si kwuo, iwe jidere nwoke ahụ, ọ yie nwunye ya egwu, were mmanụ ụgbọala dị n’ ọgba tum tum ya wee wụsa n’ahụ nwunye ya ma gbaa ya ọkụ.

Nwanyị ahụ gbanahuru ọnwụ ya ma nọrọ ugbua na anata ọgwụgwọ n’ụlọ ọgwụ Honey Gold dị na Felele.

Ndị uwe ojii kwuru na nwoke ahụ kwetara n’ajụjụ mbụ a gbara ya na ọ bụ ya mụnyere nwunye ya ọkụ. Ha amalitela nyocha zuru ezu iji chọpụta ihe niile kpatara ihe ahụ na ịchọta ihe akaebe ndị ọzọ.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited