Aka Akpatala Otu Nwoke Maka Ori Otutu Akwa Mkpuchi Oto Umunwaanyi Na Adamawa State

Written by on August 17, 2026

by Chika Nwazu

Anwụchiela otu nwa okorobịa dị afọ iri abụọ na asaa, aha ya bụ Muktar Shehu ma kpụga ya n’ụlọ ikpe Magistrate Court 3 dị na Yola bu isi obodo Adamawa State, maka ebubo izu ori akwa ime aru ụmụnwanyị ji ekpuchi ọtọ akpọrọ underwear dị iri abụọ na asaa.

A na-ebo Muktar ebubo na ọ banyere n’ụlọ otu nwanyị aha ya bụ Halima Yakubu n’ụzọ iwu na-akwadoghị, n’abalị isii nke ọnwa August n’afọ a, wee zukọrọ akwa mkpuchi ọtọ ndị ahụ dị iri abụọ na asaa nke nwanyị ahụ.

Onye ọka iwu ndị uwe ojii bụ Danjuma Hamidu, gwara ụlọ ikpe na ebubo ndị e boro Muktar gụnyere ịbanye n’ụlọ mmadụ n’enweghị ikike, izu ohi na iji ọgwụ anwansi na eme ihe.

Dị ka onye ọka iwu si kwuo, Muktar kwupụtara n’oge ndị uwe ojii na-ajụ ya ajụjụ na ọ bụ maka emume ịchụ aja ma ọ bụ ihe ndị metụtara ọgwụ ike ka o ji zuru akwa ndị ahụ.

Ụlọ ikpe nyere iwu ka a debe Muktar n’ụlọ mkpọrọ ka ikpe na-aga n’ihu. Muktar bụ sitere n’obodo Zango Ward dị na Jimeta, Yola North Local Government Area nke Adamawa State.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited