Nghotahe Na Ada Na Uka Anglican Na Anambra State Agala Na Iru Na Ari Elu Oji

Written by on October 20, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Nghotahe na ada na ulo uka Anglican, ngalaba ya nke Awka Diocese dina Anambra State agala na iru na ari elu oji kwere maka njikere onye nnukwu ukochukwu na okwa Supervising Bishop onye Primate uka ahu na ala anyi bu Most Rev Henry Ndukuba weputara ohuru bu Rt Rev Samuel Ezeofor di inoro echi bu Wednesday wuchie inapu onye Archbishop yabu Awka Diocese bu Most Rev Alexander Ibezim okwa olu ya.

Ozi kowara na Primate Ndukuba noro na odi nso a kwuputa nchitugodu na okwa Most Rev Ibezim kwere maka ebubo agwa ojo, ebe yabu Ibezim noziri na aka nke ya juu yabu nchitu na okwa, ma gaa gba akwukwo na ulo ikpe High Court dina State ahu, dika ogara na iru nwanne unya bu uka noro na isi ugbo uka akara na St. Faith’s Anglican Cathedral.

Ozi kowara na ndi nchekwa juputara ogige yabu St Faith’s Anglican Cathedral nke Awka Diocese dika ujo di megide ogbaghara idaputa ma yabu onye Bishop ohuru Ndukuba weputara wuchie ogige ahu echi.

Ka osiladi, na okwu ya oge ndi nta akuko kpoturu ya ka onye mmekorita ohaneze nyere ndi uwe ojii ala anyi na State ahu bu SP Tochukwu Ikenga mere ka amata na obughi eziokwu bu ebubo na onwere onye ma obu alaka yabu uka Anglican habu ndi uwe ojii na akwado.

SP Ikenga koro ndi nta akuko na ndi nchekwa nona ogige yabu Cathedral bu maka igbochi ogbaghara na udi obuna nyere nghotahe habu ndi isi uka.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited