Obi Akowala Udi Mmadu Kwankwaso Bu Dika Ona Emerube Ncheta Afo Iri Asaa Na Elu Uwa
Written by admin on October 21, 2026
by Chidimma Kama
Nwa amadi ahụ ga ejị ọkọlọtọ otu ndọrọndọrọ Nigeria Democratic Congress NDC zọọ ọkwa onye ịsị ala na ntule aka ọchịchị afọ 2027 bụ Mazi Peter Obi, akọwala nwa amadi ahụ gabụ osote ya bụ Dr. Rabiu Musa Kwankwaso, dịka ezigbo nwa afọ Nigeria bụkwanụ onye njikọ aka ya ga enye aka dozigharie ala anyị a site n’aka ajọ ọchịchị.
N’ozi ozigara ya iji merubere ya mmeme ncheta ọmụmụ afọ ịrị asaa ya ka Obi kwupụtara na onwere nkwanyere ugwu tọrọ atọ n’ebe Kwankwaso nọ, yanakwa mmekọrịta dị n’etiti ha abụọ tinyekwara mbọ ahụ ha n’agba iji hụ na ala anyị bụ Nigeria dị mma ọzọ.
Obi gara n’iru mee ka amata na dịka Kwankwaso na emerube ncheta ọmụmụ afọ ịrị asaa ya taata bụ Wednesday abalị ịrị abụọ na otu n’ọnwa October nke afọ a bụ 2026, na ya na akwanyere ya ugwu dịka onye rụrụ ezi ọrụ gara ọhaneze, onye ndụmọdụ ya bara ezigbo uru ma mitakwa ezi mkpụrụ, tinyekwara mbọ ọ na-agba nakwa uchu ya iji hụ na ala anyị a gara n’iru ma kwụrụ n’ogogo ka mma.
Ọ gara n’iru kọwa njem nakwa ọrụ Kwankwaso site na alaka omebe iwu na udi legislative service, nke Federal Executive Council, nke Gubernatorial Administrator na Kano State nakwa ntinye oke ya n’ihe gbasara ọdị mma ala anyị a gosipụta ezi ọrụ ya nakwa mgbakwunye nke ụmụ afọ Nigeria.

