Ntuli Aka Ochichi Afo 2027: Fubara Ekwuputala Ndi Ona Akwado Na Okwa Onye Isi Ala, Aka Na Achi State
Written by admin on October 26, 2026
by Chika Nwazu

Siminalayi-Fubara-1
Aka na-achị Rivers State bụ Gov Siminalayi Fubara, ekwuola ya hoo haa na ya na-akwado President Bola Ahmed Tinubu site n’otu nkwado a kpọrọ Rainbow Coalition na steeti ahụ.
O kwuru na oge esemokwu na ọgba aghara ndọrọndọrọ ọchịchị agwụla ebe oge udo bụ ya ka anọ ugbua na Rivers State.
Fubara kwuru nke a mgbe ọ na-agwa ndị na-akwado ya okwu site n’ihe onyonyo vidio e tinyere na owa ozi X bụ ebe ọ nọrọ kpọkuo ndị na-eso ya ka ha kwado Rainbow Coalition iji mee ka udo na ịdị n’otu dịrị gaa n’ihu na steeti Rivers.
Gọvanọ ahụ kwukwara na ya na-akwado Kingsley Chinda bụ onye ga-azọ ọkwa gọvanọ Rivers State n’okpuru otu ndọrọndọrọ ọchịchị All Progressives Congress (APC). Ọ gwara ndị kwenyere na ya ka ha kwado Chinda.
Fubara kwuru na ya alaghachila n’ezinụlọ ndọrọndọrọ ọchịchị ya, ma rịọ ndị na-akwado ya ka ha nye Rainbow Coalition nkwado zuru oke ma kwuo na ihe kacha mkpa ugbu a bụ ime ka steeti Rivers gaa n’ihu n’udo.