Arsenal Adila Njikere Inwe Nkwakorita Yana Liverpool Na Asompi Iko EPL
Written by admin on November 1, 2026
by Moses Nnabuife Nwekwu
Otu egwuregwu Arsenal adila njikere inoro taata bu uka ma ojiri okara gafee elekere ise nke uhuruchi chupu ya nyere Liverpool na asompi iko English Premier League EPL kana aga na iru.
Yabu asompi ka ozi mere ka amata na obu ya bu naani asompi enwere taata na EPL, dika otutu otu egwuregwu nochara unya bu Saturday gba nke ha, ebe otu egwuregwu Newcastle nakwa Everton ga anoro na elekere iteolu nke abali echi bu Monday zute onwe ha.
Ka odigodu na oche EPL Table ka agbachara asompi egwuregwu nke unya ka Manchester City ka nona ndi nke mbu site na akara point iri abuo na otu, ebe Arsenal ji yabu otu akara noro na ndi nke abuo, Brighton abanye na ndi nke ato site na akara iri na iteolu, dika Chelsea ji akara iri na isii agba ndi nke ano, Liverpool ana agba ndi nke ise site na akara iri na ise, ebe Brentford ji akara iri na ano agba ndi nke isii.
Ndi ozo gunyere: Bournemouth, Tottenham Hotspur, Aston Villa jicha akara iri na abuo agba ndi nke asaa, asato nakwa iteolu na otu na otu, ebe Hull City, Leeds, Newcastle nakwa Ipswich Town ji akara iri na otu agba ndi nke iri, iri na otu, iri na abuo nakwa iri na ato na otu na otu, dika Everton ji akara iri agba ndi nke iri na ano, ebe Fulham nakwa Coventry ji akara iteolu agba ndi nke iri na ise nakwa iri na isii.
Ndi ozo gunyere: Manchester United nakwa Crystal Palace ji akara asaa agba ndi nke iri na asaa nakwa iri na asato, ebe Nottingham Forest ji akara isii agba ndi nke iri na iteolu, dika Sunderland ji akara ise danye na ndi nke ikpeazu bu iri abuo.
