Ihe Mberede Okporo Uzo Akpala Ike Ojo Na Anambra State

Written by on November 15, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Ulo olu njem awele okporo uzo ala anyi bu Federal Road Safety Corps FRSC ngalaba ya nke Anambra State enyela nkowa na ozuzu oke banyere odachi ihe mberede okporo uzo mere ohuru unya bu Saturday na State ahu.

Na okwu ogwara ndi nta akuko ka onye Sector Commander yabu ulo olu Road Safety na Anambra State bu Corps Commander Bridget Aserkhauno mere ka amata na obu na mpaghara Agu-Awka, kpomkwem na Immigration Junction nke ogologo okporo uzo ahu sitere Awka biawa isi obodo Enugu ka odachi a mere na agbata ihe foro nkeji iri na ise ka okuo elekere iteolu nke ututu unya.

Aserkhauno kowara na otu onye tufuru ndu ya na ike, ebe mmadu asato nwetara ihe mmeru aru na odachi a.

Yabu onye Sector Commander ndi Road Safety kwuputara na obu ugboala abuo ndi gunyere: Sinotruck trailer, nke Toyota Camry nakwa otu ogbatumtum ukwu ato tricycle amakariri dika Keke ka ihe mberede okporo uzo a metutara site na nkuko isi ha kukoro onwe ha.

Ogara na iru kowa na nnyocha mbuzo na egosi na obu oke oso nakwa arunyeghi ihe mgbaama njem nke oma na okporo uzo butere odachi a, dika oyoro ndi okpu ugboala ka ha kwusi oke wawawa na okporo uzo okachasi oge a mmeme Christmas nakwa nke afo ohuru na akpudobe nso, ma nye ndi na aru uzo ndumodu ka ha na arunye ihe mgbaama ido aka na nti na okporo uzo nke oma na ebe ndi kwesiri ekwesi.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited