Ntule Aka Ochichi Afo 2027: Ulo Ikpe Akwusila Omo-Agege Izo Okwa Senator Delta Central Afo Ozo

Written by on November 24, 2026

by Moses Nnabuife Nwekwu

Ulo ikpe Federal High Court ji Warri nke Delta State mere onodu akabiela ikpe ma kachapu nroputa aroputara onye ahu jiburu okwa Deputy Senate President ala anyi bu Sen Ovie Omo-Agege dika onye ji okoloto otu ndorondoro Nigeria Democratic Congress NDC azo okwa Senator ogbonta vote Delta Central Senatorial District na ntule aka ochichi afo 2027.

Na nkabi ikpe ya taata bu Tuesday ka Justice H. A. Nganjiwa bu okaikpe noro na isi ikpe a mere ka amata na agbasoghi usoro iwu ntule aka ochichi ala anyi bu Electoral Act na nroputa yabu nwa amadi na ntule aka ochichi ime ulo otu ndorondoro NDC.

Justice Nganjiwa nyeziri ulo olu Independent National Electoral Commission INEC iwu ka okachapu aha Sen Omo-Agege na ndi na azo okwa na afo 2027.

Okaikpe a gara na iru kwuputa na onweghizi ohere ozo diara otu ndorondoro NDC iroputa onye ga eji okoloto ya zoo okwa yabu ogbonta vote ma elegara anya na iwu ntule aka ochichi ala anyi nyedebere ohere ntule aka ime ulo ka oghara ibanye na ime otu nari ubochi na iri asato tupu ntule aka ochichi izugbe.

Ozi mere ka amata na obu Prof Alexander Osondu Akpodiete gbara akwukwo na ulo ikpe ahu megide ntozu oke Sen Omo-Agege ma elegara anya na ihe banyere igba alukwaghim ya na otu ndorondoro All Progressives Congress APC nakwa oge ojiri banye na otu ndorondoro nke NDC.


Reader's opinions

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *



Current track

Title

Artist

owellefm.org © 2019- 2025 Owelle Media Limited